Ịchụ nta na ala Igbo

Image Source: https://www.facebook.com/IGBO-B%E1%BB%A4-IGBO-305850436640532/?__tn__=kC-R&eid=ARBHScBENDJeS-vph3K4tqCyBTrxGfaEu9Vqi7yJnukT033e4mnv1FvRmdus5u7g7g_R1xFfhQ62krNa&hc_ref=ARRywbrIpkZk1XJMsqz-nzrZDdA8AMl0WFV0L0Kmaqo6MQiWvR9VcMlBts86qJBEfoQ&fref=nf&__xts__[0]=68.ARArHwcG3828ie-PGQvjhDjNBIuU1xsCspdj0lLuCN9F2070rgbwROz0yMRN5Tl_zPj9GJO3DQm7dHsrygz3TVoCUYRSoORMA1AGPaXzCeET1JH5lO-6_zzIoQiPKCXw15nzU8s0T5_85qtJNXCabBbEXSA_E2G1WiEO2r_LTq2FaEQsEziMqwZtnHv07X51Ie2KK1xbl4Je6SsduRAyHO2oSd7FSEmN8Hq7pHFhFD4F3bcGvH5VbH1iTSHo0T0AhAR-L-4sGVZj8HgaB3l6qNjT2t6Kop1cQiDHbTKjsqIHjUX_2Dp1NpURmxOUnDa_8YZFOXTqnE191LKkAsPNxD3lstoRl3UsJQ0uSCOBlpjOmnaVPS1OHWc

Ịchụ Nta

Ịchụ nta bụ aka ọrụ a na-akwanyere ugwu tụmadi n’obodo nwere nnukwu ọhịa n’ala Igbo. Ịchụ nta dị iche iche. Ndị okenye na-achụ nta, ebe ụmụ ntakịrị na-achụkwa nke ha. Ndị Igbo na-akwado ụmụaka ịchụ nta ụmụ obere anụ dị ka ngwere na nnụnụ.

Ụmụaka na-eji katapult were na-achụ nke ha. A naghị ekwe ka ha were ihe dị ka egbe, ụta ma ọ bụ mma. Naanị ndị okenye pụrụ i ji ihe ndị a gaa nta; ụmụaka eme merụọ onwe ha arụ. Ụbọchị ọ bụla akwadoro nta, a na-ebu ụzọ fụọ opi.

Nke a ga-agwa ndị nta ndị ọzọ na ọ ruola n’omume. Maka ịchụ nta n’ala Igbo abụghị ihe otu onye na-aga naanị ya. Nkịta a zụrụ azụ na-esokwa aga. Ọ na-ewo mgbịrịgba n’olu, nke na-enye aka eyi ụmụ anụmanụ nọ n’ime ọhịa egwu; ha ewee gbapụta n’ebe ha zoro.

Ọzọkwa, nkịta na-anụ isi nke ọma. Ọ na-eji imi ya achọpụta ebe ụfọdụ ụmụ anụmanụ gbabara. Ụfọdụ oge ụmụaka na-esokwa aga. Ha ruo, ha na nkịta a na-eme mkpọtụ.
Mgbe nke a na-eme ndị nta na-agba ọhịa okirikiri.

Anụ ọ bụla gbapụtara ha edulaa ya mmụọ. Ụmụ nwaanyị na-enyekwa aka ụfọdụ oge, dịka i soo di ha laghachi azụ n’ọhịa nyere aka bụlaga ọtụtụ anụ e gburu mgbe ọ bụla e gburu anụ hiri nne.

A na-ekekwa anụ ọ bụla e gburu ọfụma. Mana dinta ọ bụla gburu ya ga-ewere isi ya, tutu e kere gawa. Anụ e gburu hie nne, ndị Igbo na-ekenyekwa ndị enyi na agbataobi ha. Oke nkịta so ga nta ga-erukwa ya aka.

Gịnị ka ị chere maka nke a??

Cheta kwa na Nke a bụ nke anyị

2019 foods that can help Igbo woman develop flat tummy

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here